Login /Register

Log in  \/ 
x
x
Register  \/ 
x

E-Book With Sample Texts and Demo Audios. Please Test-Drive Before Subscribing

OTU ỤBỌCHỊ - 1 DAY

$2/day

                               ISI NKE MBỤ 

Okonkwọ bụ nwoke a maara nke ọma n’obodo toolu ahụ niile ma gafekwaa. Ebube ya sitere n’ike niile ọ kpara. Dị ka nwa okorọbịa dị afọ iri na asatọ, o wetarala ndi obodo ya ugwu site n’ịtụ Amalịnze  nke a na-akpọ nwamba n’ala na mgba. Amalinze bụ ọkamgba ahụ nke ọ dịbeghị onye meriri ya n’ime afọ 

Play Sample Audio below:

Signup below for full Text and Audio:

 

OTU IZUKA - 1 WEEK

$7/7 days

                        ISI NKE ASAA                                                                                                                                                                         

 

Afọ atọ ka Ikemefuna biri n’ụlọ Okonkwọ. O wee dịzi ka ndị ichie Ụmụọfịa echefuola ihe gbasara ya. O toro poko poko ma gbaakwa dimkpa dị ka ome ji na-epu n’udu mmiri. Ha nabatara ya nke ọma n’ezinaụlọ ọhụrụ ya. Ọ dị ka ọ bụ ya tọrọ Nwoye na nwanne. Site n’isi mbido, ọ dị ka o tinyela ndụ ọhụrụ n’ime Nwoye. O mere ya ka onye torola eto; Ha adịghịkwa anọ n’usekwu n’anyasị ele nne Nwoye mgbe ọ na-esi nri, kama ha na Okonkwọ na-anọ n’obi ya, ma ọ bụ na-ele ya anya mgbe ọ na-akụ ngwọ anyasị. Ọ dịghị ihe na-atọkarị Nwoye ugbu a ka nne ya ma ọ bụ ndị nwunye nna ya ịkpọ ya ka ọ bịa rụọrọ ha ọrụ ndị ahụ siri ike nwoke na-arụ n’ụlọ dị ka ịwa nkụ ma ọ bụ ịsụ nri. Ọ bụrụ na o nweta ụdịrị ozi a site n’aka nwanne ya nta, ọ ga-eme ka iwe ana-ewe ya ma kwuputa ntamụ ya n’ihe gbasara ụmụ nwanyị na nsogbu ha.

N’ime onwe ya, obi na-atọ 

Play Sample Audio below: 

Signup below for full Text and Audio:

 

OTU ỌNWA-1 MONTH

$15/30 days

                 ISI NKE IRI NA ISE                     

                                                               

                                                                                   

Ọ bụ n’afọ nke abụọ Okonkwọ gbachara ọsọ ndụ ka enyi ya nwoke Obierika bịara ileta ya. Ọ kpọ ụmụ okorọbịa abụọ bịa, nke ọ bụla bu akpa dị arụ n’isi ya. Okonkwọ nyeere ha aka butuo ibu ha n’ala. O were ya anya na ọ bụ ego ayọrọ jupụtara na ha.

Obi tọrọ Okonkwọ ụtọ ịhụ enyi ya. Obi tọkwara ndị nwunye ya na ụmụaka ya ụtọ nakwa ụmụ nwanne ya n’ikwunne ya na ndị nwunye ha mgbe Okonkwọ kpọrọ ha wee kọwaara ha onye onyeọbịa ya bụ.

Otu n’ime ha gwara ya na ọ ga-akpọrọ onye ahụ ka ọ gaa kelee nna ha.

Okonkwọ zara ya sị: “Eee, anyị na-aga otu ihu.” Ma, tupu ha agawa, ọ takwụnyere isi nwunye ya ihe na ntị. 

Otu nwa nwa Uchendụ agwala ya na ndị ọbịa atọ bịara n’ụlọ Okonkwọ. Ya mere, ọ naara eche ịnabata ha. O kwere ha n'aka. Mgbe ha kwechara n’aka a,  

Play Sample Audio below: 

Signup below for full Text and Audio:

 

Web Analytics
X

Right Click

No right click