THINGS
|
Ihe a na-ahu n'ulo :
Ife a na-afu n'uno :
What you see at homes. |
|
English/Igbo |
Igbo & English
|
|
1 House
Ụlọ
Ụnọ
|
Nne m na Nna m zụrụ ụlọ ọhụrụ
Nne m na Nna m golu ụnọ ọfụlụ
My mother and Father bought a new house My parents bought a new home
Nne = Mother Nna = Father Zụrụ = buy(bought) Golu = buy(bought)
Ụlo (Ụnọ) = house/home Ohụru (ọfụlu) =new |
|
2 Living Room/ Parlour Palọ
Mbala Ụnọ
|
Palọ anyị buru ibu
Mbala ụnọ anyị bulu ibu
Our living room is large
Vocabulary: Palọ = Igbo version of Parlour/living room anyị = our; buru ibu= is big
|
|
3 Bedroom Nkpuka ihi Ụra
Mkpuke ilalụ ụla
|
Nke a bụ "Nkpuka" ihi Ụra n'ụlọ anyị
Nke a bụ "Mkpuke" ilalụ ụla n'ụnọ anyị
Nke a bụ "Mkpuke" ilalụ ụla na banyị
This is a bed room in our house |
|
4 Food
Nri
Nni
Hamburger –
Hambọga
-------------
Pounded Yam Nri ji
Nni ji
Pounded yam |
Nne m ma esi nri {mp3}gh4em{/mp3}
Nne m ma esi nni
My mother knows how to cook
Nri a bụ hambọga
Nni a bụ hambọga
This food is hamburger ----------- Ihe a bụ nri ji
Ife a bụ nni ji
This is pounded yam
Vocabulary: Nne = Mother; ma = knows; esi = to cook |
|
5 Dinning Room/ Area
Ebe a na-eri nri
Ebe a na-eli nni
Dinning Room/ Area
|
Anyị nọ n'ebe a na-eri nri" n'ụlọ anyị
Anyị nọ n'Ebe a na-eli nni n'ụnọ anyị
We are eating in our dinning room/area
|
|
6 Bathroom
Mkpuka isa ahụ
Mkpuke isa arụ
|
Nke a bụ "Mkpuka" isa ahụ
Ife a bụ "Mkpuke" isa arụ
This is a bathroom |
|
7 Toilet Seat
Mkpuka inyụ mamịrị
Mkpuke Inyụ amịlị
|
Ebe a bụ "Mkpuka"inyụ mamịrị
Ebe a bụ "Mkpuke" Inyụ amịlị
This is a toilet or a place we pee
|
|
8 Chair, Seat, Couch Oche
Oche
|
Nne m nwere ezigbo "Oche" n'ụlọ anyị
Nne m nwelụ ezigbo "Oche" n'ụnọ anyị {mp3}gh8bm{/mp3} My mother has a nice couch/ seat/chair in our house
|
|
9 Box or suite case or a luggage Igbe
Akpatị
|
Nna m zụrụ "Igbe"
Nna m golu "Akpatị"
My father bought a box or suite case or a luggage
|
|
10 Door
Ụzọ
Ụzọ
|
Biko, mehee "Ụzọ"
Biko, mepe kene "Ụzọ"
Please, open the door
|
|
11 Window Ụzọ nta
|
Biko, mechie "Ụzọ nta"
Please, close the window
|
|
12 Bed Ákwá
Akwa
|
Lee "Ákwá" m
Nekwa Ákwá m
Look at my bed or see my bed
|
|
13 Clothes Akwa
Akwa
|
Nne nne m na-eyi "Akwa" mara nma
Nne nne m na-eyi "Akwa" malụ nma
My grand mother Wears beautiful attire/clothing
|
|
14 Towel
Akwa ihicha ahụ
Akwa ificha arụ
|
Akwa ihicha ahụ m di ọhụọ
Akwa nficha arụ m di ọfụọ
My towel is new
|
|
15 Dress
Uwe
Afe
|
Nwanne m nwanyị na-eti "Uwe" mara nma
Nwanne m nwanyi na-eyi afe mara nma
My sister wears nice dresses or outfits
|
|
16 Hat or Cap Okpu
Okpu
|
"Okpu" mee Mee ka-eji ama ndi Eze
"Okpu" mee mee ka-eji amalu ndi Eze
Red hats are symbolic of Kings (Eze)
|
|
17 Light Ọkụ
Ọkụ
|
Ụlọ anyị n'ime Obodo enweghị "Ọkụ"
Ụnọ anyị n'ime Obodo enwero "Ọkụ"
Our village house does not have light |
|
18 Ceiling Fan
Akupe Bekee
Akupe Oyibo
|
Nke a bụ "Akupe Bekee" anyị na Kalifonịa
Ife a bụ "Akupe Oyibo" anyị na Kalifonịa
This is a Ceiling Fan in California
|
|
19 Air Conditioner
Ntu Oyi
Ntụ Oyi
|
Ntu Oyi bara uru na Naijiria
Ntụ Oyi balụ ụlụ na Naijiria
Air Conditioner is important in Nigeria
|
|
20 Shoes
Akpụkpọ ụkwụ
Akpụkpọ ụkwụ
|
Nneka nwere "Akpụkpọ ụkwụ" mara nma
Nneka nwelụ "Akpụkpọ ụkwụ" malụ nma
Chinwe has nice Shoes |
|
21 Mirror Enyo
Enyo
|
Lee onwe gi na "Enyo"
Kilie onwe gi na "Enyo"
Nene onwe gi na "Enyo"
Look at yourself in the mirror
|
|
22 Television (TV) Ihe Onyinyo
Ife enyonyo
|
Anyị nwere "Ihe Onyinyo" n'ụlọ anyị
Anyị nwelụ "Ife enyonyo" n'uno anyị
We have a TV in our house |
|
23 Dog
Nkịta
Nkita
|
Nkịta na-eche ụlọ anyị nche
Nkita na-eche ụnọ anyị nche
A dog guards our home/house |
|
24 Cats Nwamba
Nwamba
|
Anyị nwere Nwamba
Anyi nwelu nwamba
We have three cats in our house/ home
|
|
25 Swimming Pool
Ebe igwu mmiri
Ebe igwu mmili
|
Anyị nwere "Ebe a na-egwu mmiri" n'azụ ụlọ anyị
Anyị nwelụ "Ebe a na-egwu mmili" n'azụ ụnọ anyị
We have a swimming pool in our back yard
|