THINGS
|
Ihe a na-ahu n'ulo umu anumanu:
Ife a na-afu n'uno umu anumanu:
Things Seen: Animals/Zoo |
|
IGBO/ ENGLISH |
IGBO SENTENCES & ENGLISH |
|
1 Adaka
Adaka Baboon
|
Adaka na-ezu ike n'elu osisi
Adaka na-ezu ike n'enu osisi
A Baboon is resting on a tree top |
|
2 Agụ
Agụ Tiger |
Agụ na Ọdụm bụ Eze ụmụ anụmanụ
Tiger and Lion are kings of the animals |
|
3 Agụ Iyi
Agụ Iyi Crocodile |
Anyị huru Agụ Iyi na Mmiri ukwu
Anyị fụlụ Agụ Iyị na nnukwu Mmili
We saw a crocodile in the Ocean |
|
4 Agwọ
Agwọ Snake |
Nke a bụ Agwọ dị odo odo
This is a yellow Snake Ife a bụ agwọ dị ogonogo
This is a long snake
|
|
5 Ụmụ Anụmanụ
Ụmụ Anụmanụ Animals |
Lekwa ebe "Ụmụ Anụmanụ" zukọtara
Nekwa ọgbakọ "Ụmụ Anụmanụ"
Look at a gathering of animals |
|
6 Aṅụ
Anwụ
Bee |
Anụ gbara Chike n'anya
Anwụ gbala Chike n'anya
A bee stung Chike's eye Vocabulary: Chike = name of a male anya = eye |
|
7 Anwụnta
Anwụnta Mosquito |
Anwụnta tara Nwanne m nwoke
Anwụnta talụ Nwanne m nwoke My brother was bitten by a mosquito Vocabulary: tara (talụ) = Bite Nwanne m nwoke = my brother
|
|
8 Akika
Akika Termite |
Akịka tara ụlọ onye agbata obi anyị
Akịka talụ ụnọ onye agbata obi anyị
Termite destroyed Our neighbor's house Vocabulary: ụlọ (ụnọ) = house onye agbata obi = neighbor anyị = Our (Us)
|
|
9 Atụrụ
Atụlụ
Sheep |
Nke a bụ Atụru nọ n'ubi
Ndi a bụ Atụlụ nọ n'ubi
These are Sheep in a farm Vocabulary: nọ = lives; stays; habituates ubi = farm
|
|
10 Awọ
Awọ Frog |
Nke a bụ Awọ nọ n'elu osịsị
Ife a bụ Awọ nọ n'enu osisi
This is a frog on a tree Vocabulary: Nke a = This bụ = is Nọ = staying; on Elu (enu) = top; osisi = tree
|
|
11 Azụ
Azụ Fish |
Ihe a bụ Azụ ndụ
Ife a bụ Azụ ndụ
This is a fresh fish Ihe (ife) = This; bụ = is ndu = life(fresh) |
|
12 Egbe
Egbe Kite |
Egbe buuru nwa ọkụkọ anyị
Egbe buulu nwa ọkụkọ anyị
A kite carried our Chick Vocabulary: Anyị = Our (Us) |
|
13 Ehi
Efi
Cow |
"Ehi" nke a gbara agba
Nke a bụ nnukwu "Efi"
This cow is huge |
|
14
Ejula
Ejuna
Snail |
Nne m tere ofe Ejula
Nne m sili ofe Ejuna
My mother prepared a snail's soup Vocabulary: Nne = Mother siri(sili) = cooked, prepared ofe = soup
|
|
15 Ele
Ene
Antelope |
Nke a bụ Ele nọ n'ọhịa
Ife a bụ Ene nọ n'ọfịa
This is an Antelope |
|
16 Enyi
Enyi Elephant
|
Enyi nke a gbara agba nke ukwuu
Enyi nke a gbala agba rinne
This is a mighty Elephant Vocabulary: ukwu = big |
|
17
Enyi Mmiri
Enyi Mmili
Hippopotamus |
Enyi Mmiri bụ eze mmiri
Enyi Mmili bu eze mmili
Hippopotamus is The king of the sea
|
|
18 Enyi Nnụnụ
Enyi Nnụnụ Ostrich |
Nwanne m nwoke hụrụ Enyị Nnụnụ
Nwanne m nwoke fulụ Enyị Nnụnụ
My brother saw an Ostrich Vocabulary: Nwanne Nwoke = Brother huru (fụlụ) = see, saw
|
|
19 Enwe
Enwe Monkey |
Enwe nọ n'elu osisi
Enwe nọ n'enụ osisi
A monkey is on a tree Vocabulary: nọ = stays, resides, n'elu osisi = tree top n'enụ osisi = tree top |
|
20 Ewu
Ewu Goat |
Nke a bụ Ewu ọcha
Nke a bụ Ewu ọcha This is a white Goat Vocabulary: ọcha = white
|
|
21 Ewi
Ewi Rabbit |
Anyị gbara ọnya ewi
Anyị gbalụ ọnya ewi
We set a trap for a Rabbit |
|
22 Ezi
Ezi Pig |
Anụ Ezi na-atọ enyi m ụtọ
Anụ Ezi na-asọ oyi m ụsọ
My friend enjoys Pig meat (beacon) ụtọ (ụsọ) = sweet; enjoy; nice Enyi (Ọyi)= friend
|
|
23 Idede
Spider Igere Idede
Spider Web |
Ahụrụ m Idede dị n'ime obodo
Afụlụ m Idede dị n'ime obodo
I saw a spider in the village |
|
24 Ichoku
Ichoku Parrot |
Ichoku bụ nnụnụ mara nma
Ichoku bụ ọmalicha nnụnụ
A parrot is a beautiful bird
|
|
25 Igwurube
Igwurube Locust
|
Igwuribe mebiri ubi anyị
Igwuribe mebili ubi anyị
Locust devoid our farm |
|
26 Ikporikpo
Ikpolikpo
Peacock
|
Ikporikpo bụ nnụnụ mara mma
Ikpolikpo bụ nnụnụ mala mma
Peacock is a beautiful bird |
|
27 Iji
Ijiji
Fly |
Iji dị n'ime obodo nke ukwuu
Ijiji dị n'ime obodo rinne
There are lots of flies in the village |
|
28 Inyinya
Anyanya
Horse |
Nna m nọ n'elu Inyinya
Nna m nọ n'enụ Anyanya
My father is on top of a horse |
|
29 Inyinya Ibu
Anyanya Ibu
Donkey |
Nna m nwere Inyinya Ibu
Nna m nwelụ Anyanya Ibu
My father owns a Donkey |
|
30 Ikwikwi
Ikwikwi Owl |
Ikwikwi na-atụ m egwu
Ikwikwi na-eji m ụjọ
I am scared of owls |
|
31 Mbe
Mbe Tortoise/Turtle
|
Mbe na-aghọ aghụghọ
Mbe na-aghọ agụghọ The Tortoise is a tricky animal |
|
32 Mbara
Mbala
Toad
|
Mbara na Awọ bụ nwanne
Mbala na Awọ bụ nwanne
A Toad and a frog are related |
|
33 Nkapị
Nkakwụ
Shrew |
Nkapị na-esi isi
Nkakwụ na-esi isi
A shrew smells |
|
34 Ngwere
Ngwele
Lizard |
Nke a bụ Ngwere na-acha akwụkwọ ndụ
Ife a bụ Ngwele na-acha akwụkwọ ndụ
This is a green lizard Vocabulary: na-acha = to have a color akwụkwọ ndụ = green |
|
35 Nkịta
Nkita Dog |
Nkịta na-eche ụlọ anyị
Nkita na-eche ụnọ anyị
A dog guards our home/house |
|
36 Nwamba
Nwamba Cats |
Nwamba dị n'ụlọ anyị dị atọ
Nwamba dị n'ụnọ anyị dị atọ
We have three cats in our house/home |
|
37 Nsikọ
Nrikọ
Crab |
Ofe Nsikọ na-atọ ụtọ
Ofe Nrikọ na-asọ ụsọ
Crab soup is delicious Vocabulary: ofe = soup na-atọ or na-asọ = is delicious |
|
38 Ụgbala
Ụgbana
Ọbọgwụ
Duck |
Lekwa Ụgbala na nwa ya
Nekwa Ụgbana na nwa ya
Nekwa Ọbọgwụ na nwa ya
Look at a duck and a duckling Vocabulary: na = and Nwa = child |
|
39 Ọdụm
Ọdụm Lion |
Ọdụm na Agụ bụ Eze ụmụ anụmanụ
Ọdụm na Agụ bụ Eze ụmụ anụmanụ Lion and Tiger are kings of the animals |
|
40 Ọgazi
Ọgazi Guinea Fowl |
Anụ Ọgazi na-atọ ụtọ
Anụ Ọgazi na-asọ ụsọ
Guinea Fowl's meat tastes good |
|
41 Oke
Oke
Rat |
Nwamba na-ata Oke
Nwamba na-ata Oke A cat eats rats Vocabulary na-ata = chews(eats) |
|
42 Oke Bekee
Oke Oyibo
Guinea Pig |
Oke Bekee ka eji amụ ihe
Oke Oyibo ka eji amụ ife
Guinea Pigs are used for experiments |
|
43 Ọkụkọ
Ọkụkọ Fowl |
Nke a bụ Ọkụkọ buru ibu
Ife a bụ Ọkụkọ bulu ibu
This is a large (big) Fowl |
|
44 Ọkwa
Patridge |
Ọkwa na Ọkụkọ bụ nwanne
Vocabulary: na = and nwanne = brother (sister)/relations |
|
45 Ọzọ
Ọzọ Chimpanzee |
Ọzọ na Enwe bụ nwanne
Ọzọ na Enwe bụ nwanne Chimpanzee and Monkey are related |
|
46 Ọzodimgba
Ọzodimgba Gorilla |
Ọzodimgba na Ọzọ bụ nwanne
Ọzodimgba na Ọzọ bụ nwanne Gorilla and Chimpanzee are related |
|
47 Ọsa
Ọsa Squirrel |
Ọsa na Mmadụ bụ enyi n'Amirika
Ọsa na mmadụ bụ ọyị n'Amirika
Humans and Squirrels are friendly in the USA |
|
48 Ụchịcha
Ụchịcha Cockroach |
Uchicha na-ebuta ọrịa n'ụlọ
Uchicha na-ebute ọyịa n'ụnọ
Cockroach brings diseases into homes |
|
49 Udele
Udene
Vulture |
Udele bụ anụ ojọọ
Udene bụ ajọ anụ
A Vulture is an ugly creature |
|
50 Ugo
Ugo Eagle |
Ugo bụ oke nnụnụ
Ugo bụ oke nnụnụ The eagle is a great bird |
|
51 Torotoro
Tolotolo
Turkey |
E ji anụ Torotoro na eme ememe inye onyinye n’Amirịka
E ji anụ Tototolo na eme ememe inye onyinye n’Amịrịka
Turkey is used for Thanksgiving Celebration in America |